13 Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku! Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu: Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide.
Jehova, nkpuru-obim adighi elu, anyam abua ebulighi kwa onwe-ha elu; Ejegharighkwam n'ihe uku di iche iche, Ma-ọbu n'oké ọlu di iche iche karirim.
Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.
Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:
Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:
Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.
Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.