O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.
Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.
Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,
nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;