Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?
Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?
Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke.
Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.
Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube: