Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.
ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.