26 N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.
26 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi? Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?
Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.
N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.
N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.
Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.