Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.
N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.
Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.
M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.
Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.