Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 3:24 - Bible Nso

24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 3:24
21 Iomraidhean Croise  

Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.


Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji; Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.


Ihe anākwagide ka obi-ya bu, ọ gaghi-atu egwu, Rue mb͕e ọ gēlekwasi ndi nākpab͕u ya anya.


Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.


Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.


M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu.


N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.


I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;


Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.


Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.


Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.


Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.


N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.


Mb͕e nka gasiri m'we teta, we hu; uram we tọm utọ.


Mu onwem gāzù ìgwè ewu na aturu nkem, Mu onwem gēme kwa ka ha makpue amakpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.


Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.


M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.


Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan