17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.
17 Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.
Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile.
Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.
Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya.
Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.
Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.
I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.
Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike.
Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.
Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;