11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:
11 Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.
Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;
Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe.
Ma mb͕e anēkpe ayi ikpé, Onye-nwe-ayi nēzí ayi ihe, site n'inye ayi ahuhu, ka ewe ghara imakọ ayi na uwa ikpé.
N'ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n'obi:
I gāma kwa n'obi-gi, na, dika nwoke si adọ nwa-ya nwoke aka na nti, otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nādọ gi aka na nti.
na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.
Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.