N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.
Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.
Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;
Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.
Ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, unu gēlezi anya ime ya, ka unu we di ndu, ba uba, we ba nime, nweta kwa ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha.