Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 29:4 - Bible Nso

4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 29:4
19 Iomraidhean Croise  

Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.


Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n'ihi na Chineke-gi huru Israel n'anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.


Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi: Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.


Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya; Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.


Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.


Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze: Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.


Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.


Eze nke nānọkwasi n'oche ikpé Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.


Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.


Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Ma otù onye nke nēme ka onye nke nāchi n'ihe-ike gabiga n'ima-nma ala-eze ahu gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya: ma n'ubọchi ole-na-ole ka agētipia ya, ma ọ bughi n'iwe, ọ bughi kwa n'agha.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan