Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 28:8 - Bible Nso

8 Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 28:8
13 Iomraidhean Croise  

ma nwa-nne-aturu ahu, ọ gākwughachi kwa ya ob͕eye ahu okpukpu anọ, n'ihi na o mere ihe a, na n'ihi na o nweghi ọmiko.


Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere, Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.


Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.


Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.


Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.


Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari! Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.


N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.


o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.


nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu,


Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan