Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 28:27 - Bible Nso

27 Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 28:27
14 Iomraidhean Croise  

O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.


Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.


Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.


Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.


Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi; N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.


Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:


Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.


Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.


I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.


Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan