Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 28:11 - Bible Nso

11 Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu; Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 28:11
18 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.


Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.


Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.


Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.


Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka.


Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.


Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.


Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.


Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:


Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!


N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;


Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu.


Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan