Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.
Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.
buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.