26 Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa:
26 Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
Ọ buru na úkwù-ya agọzighm, Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;
Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.
Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.
Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.