Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 27:20 - Bible Nso

20 Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì; Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 27:20
15 Iomraidhean Croise  

Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.


Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?


Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.


Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.


Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n'ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n'ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n'inu ihe.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju.


N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.


Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.


E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.


Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.


N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan