Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 26:4 - Bible Nso

4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 26:4
14 Iomraidhean Croise  

o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.


Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.


Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.


Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.


Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.


Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya.


Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan