Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 26:21 - Bible Nso

21 Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 26:21
8 Iomraidhean Croise  

Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.


O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.


Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom.


Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.


Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.


Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.


N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan