Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri.
Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel;