Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 25:2 - Bible Nso

2 Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu: Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 25:2
20 Iomraidhean Croise  

Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu?


Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:


ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.


M'we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya.


Ma ub͕u a, ọ buru na ọ di eze nma, ka achọ n'ulo àkù eze, nke di n'ebe ahu nime Babilon, ma ọ bu ezie na esitere n'aka Sairọs, bú eze, nye iwu iwu ulo a nke Chineke nime Jerusalem, ka eze zite-kwa-ra ayi ihe nātọ ya utọ bayere okwu a.


Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n'ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon.


Nna ka m'buru ndi-ob͕eye: Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.


Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa? Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.


Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya.


Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata.


Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.


Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya, Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.


M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.


Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.


Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan