Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 25:18 - Bible Nso

18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 25:18
12 Iomraidhean Croise  

Ha amuwo ire-ha dika agwọ; Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah


Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.


Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.


Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.


Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.


O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.


Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?


Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.


Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan