17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.
17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi; Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.
Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.
mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)