Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 25:14 - Bible Nso

14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighi Ka onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 25:14
11 Iomraidhean Croise  

Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?


ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.


Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus, Onye bu onye agọziri agọzi rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọ matara na ekwughi m okwu-ugha.


Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan