Ilu 25:12 - Bible Nso12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọma Ka onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya. Faic an caibideil |
Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.