Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 24:9 - Bible Nso

9 Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 24:9
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile.


Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.


Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.


Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.


Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa; E, iru-uka na nlelì gākwusi.


N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di: Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ.


Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.


Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.


Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì: Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.


onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.


Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi?


N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa:


ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.


Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n'obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n'obi-unu?


Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi.


ebe ayi nēweda ihe anātule n'obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n'agha iṅa nti Kraist;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan