33 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:
33 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.
Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.
Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.
Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.
Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya.
Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.
N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.