20 N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
20 Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya: N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.
Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?
Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.
N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.
Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.
Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe: Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.
Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.
Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.
Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu.
ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.