Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 24:16 - Bible Nso

16 N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ: Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 24:16
30 Iomraidhean Croise  

Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.


Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.


Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.


Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe.


Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.


Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah


Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya, Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.


Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa, Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.


Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.


Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu: Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.


Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.


N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?


N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Ha ga-ada, ghara ibili ọzọ? madu, ọ̀ gādaghachi azu, ghara ilata?


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ihe ọjọ, otù ihe ọjọ; le, ọ biawo.


Nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke adawo; ọ gaghi-ebili ọzọ: atusawo ya n'ala-ya; ọ dighi onye nēme ka o bilie.


Ndi ji ikpe-ọmuma Sameria aṅu iyi, si, Chineke-gi nādi ndu, Dan; na, Uzọ Bia-sheba nādi ndu; ha gāda kwa, ghara ibili kwa ọzọ.


Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.


Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.


Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan