Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.
Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.
N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;
Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu.
Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.