Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 23:35 - Bible Nso

35 Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 23:35
11 Iomraidhean Croise  

I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.


Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.


Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.


ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.


Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.


Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.


o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku:


Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n'ituru n'apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan