32 N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.
32 Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.
Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.
Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha.
Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.
I we sua udè n'ikpe-azu-gi, Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru.
Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n'elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya.
N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:
Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala.
ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?
N'ihi na, le, M'ganēzite agwọ, bú ubí, n'etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.
Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.
Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.
Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;