Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 23:28 - Bible Nso

28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe, Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 23:28
15 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya.


Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu: Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.


N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.


Ma, le, otù nwanyi zutere ya Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.


Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.


Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.


mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n'iru Chineke gēsi n'aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie.


Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:


Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan