25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
25 Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.
Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.
Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem:
Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria, Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu.
Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.