Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 23:18 - Bible Nso

18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 23:18
11 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.


Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.


Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume: N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye, Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.


Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi: Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.


N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.


N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.


Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.


dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.


Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan