13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
13 Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.
Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.
Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti, Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.
Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.
Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.
Nātachinu obi ka ewe zí unu ihe site n'inye unu ahuhu; n'ihi na Chineke nēmeso unu dika umu; n'ihi na ònye bu nwa ahu nna-ya nādighi-ezi ya ihe site n'inye ya ahuhu?