Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 23:10 - Bible Nso

10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi; Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 23:10
17 Iomraidhean Croise  

I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu, Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.


Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:


Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.


Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.


Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.


Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.


Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi, Nke nna-gi-hà kpaworo.


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya;


ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:


unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ókè-ala ab͕ata-obi-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan