Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 22:12 - Bible Nso

12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma, Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 22:12
17 Iomraidhean Croise  

Onye nke Chineke we zigara eze Israel ozi, si, Lezie onwe-gi anya, ka i ghara igabiga ebe ahu; n'ihi na n'ebe ahu ka Siria nāridata.


N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha.


Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.


Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya, Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.


Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí: N'etiti amá ka agēb͕um.


ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.


Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n'ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan