Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 21:8 - Bible Nso

8 Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu: Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 21:8
25 Iomraidhean Croise  

Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.


Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.


Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:


Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.


Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha, Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.


Le, nání nka ka m'chọtaworo, na Chineke mere madu ka o zie ezi; ma ha onwe-ha achọputawo ọtutu ihe echèputara.


Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.


Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.


Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.


Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta.


Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n'ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n'ihe: n'ihi na amara osisi site na nkpuru-ya.


Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke.


ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe.


n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu?


Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,


Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.


Onye ọ bula nke nwere olile-anya nka n'ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan