Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.
Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:
Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n'ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n'ọchichiri.
Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.