Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 21:30 - Bible Nso

30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 21:30
20 Iomraidhean Croise  

Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya.


O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n'ebe i nọ.


Otù onye nime ndi-orù-ya we si, É-è, onye-nwem eze: kama Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n'Israel, o nēgosi eze Israel okwu nile nke i nēkwu n'ime-ulo-ndina-gi.


Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?


Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.


Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.


Asim, Ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu, na ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha: ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum?


Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.


M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala:


ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.


Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi.


na, Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà; n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan