3 Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe Bu ihe Jehova nārọputa kari àjà.
3 Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.
Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:
Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile.
Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.
N'ihi na ebere atọwom utọ, ọ bughi àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile.
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:
na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.
Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.