Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 21:24 - Bible Nso

24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 21:24
15 Iomraidhean Croise  

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.


Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.


Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.


Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.


Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.


Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.


N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.


E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.


Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan