23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
23 Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
Jehova, Do nche n'iru ọnum; Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua.
N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi: Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.
Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya: Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.
Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu.