Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.
Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya.
ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist: