Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 21:16 - Bible Nso

16 Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu, Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 21:16
20 Iomraidhean Croise  

Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye; Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu: Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu; Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.


Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.


Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.


Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya: Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.


Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi, Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;


Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti; Ọ bu kwa n'iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.


Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,


Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan