Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 21:12 - Bible Nso

12 Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 21:12
20 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.


Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.


Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo: Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.


Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.


Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah


Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ: Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.


Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.


Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.


Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari: Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.


Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan