5 Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya.
5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.
Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.
N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.
Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?
N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.