Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 20:28 - Bible Nso

28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze: O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 20:28
11 Iomraidhean Croise  

Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma.


N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi, Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.


Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.


Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile: Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.


O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.


Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.


Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume: Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.


Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi, Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:


Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n'ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n'ezi-okwu, n'ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume.


nka bu akukọ-isi-ya, eze, iwu nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ bu kwa, nke ruteworo onye-nwem, bú eze, aru:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan