Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 20:21 - Bible Nso

21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu; Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 20:21
13 Iomraidhean Croise  

Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.


Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.


Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.


Ikpa àkù site n'ire okwu-ugha Bu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.


Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka.


Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.


Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.


Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.


Ndia, hà nile agaghi-atu ilu megide ya, na okwu miri emi, ọbuná okwu omimi di iche iche, bayere ya, si, Ahuhu diri onye ahu nke nēme ka ihe nābughi nke ya ba uba! rùe ole mb͕e? onye ji ihe-ibe ebob͕u onwe-ya!


Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.


Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.


Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan