17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.
17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.
Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.
n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;